Kedụ mgbe i kwesịrị ise ndị uweojii onyonyoo?
Otu okwu a kpụ n'ọnụ ugbua bụ ihe gbasara ise ndị uweojii onyonyoo oge ha na-arụ ọrụ. Nke ugbua abụghịzikwa ma iwu ọ kwadoro ya ka ọ bụ na ọ kwadoghị ya, kama, etu e kwesịrị isi mee ya. Mana, ọ bụ gịnị kpalitere okwu a?
N'ụbọchị Tuzde 8 Septemba 2026, ka Tunji Disu bụ Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa kpọrọ oku ka ndị Naịjirịa hie aka n'anya oge ha na-emejupụta ikike ha nwere ise ndị uweojii onyonyoo oge ha na-arụ ọrụ.
Onyeisi ndị uweojii kwuru na a kwaala ndị uweojii aka site na nchabi ikpe ụlọikpe nyere ka a na-ese ndị uweojii onyonyoo oge ha na-arụ ọrụ 'a kwụsị, e nyochaa" n'ọha, ma kwuo na nke ahụ emeela ka ụmụafọ Naịjirịa malite ise ndị uweojii onyonyoo n'ebe niile, ọbụladị n'ụlọ oriri, bụ nke mere ka ike ọrụ na-agwụ ndị uweojii.
Kedụ oge e nyere nchabi ikpe a, ọ bụ gịnị kpatara ya?
N'ụbọchị 17 Maachị 2026 ka Ọkaikpe nọ n'isi Ụlọikpe Ukwu Etiti dị na Warri Delta Steeti bụ Hyeladzira Nganjiwa kwupụtara na iwu kwadoro ụmụafọ Naịjirịa ise ndị uweojii onyonyoo oge ha na-arụ ọrụ e dunyere ha n'ọha, ma gwa ndị uweojii ka ha na-egosipụta aha ha mgbe ọbụla ha nọ n'ọrụ.
Ọkaikpe Nganjiwa kwuru nke a oge ọ na-achabi ikpe n'akwụkwọ Ọkaiwu Maxwell Nosakhare Uwaifo gbara n'ụlọikpe ahụ oge ya na ndị uweojii na-arụ ọrụ 'a kwụsị e nyochaa' nwechara nghọtahie n'ọnwa Mee 2025.
Ka o ruru n'ọnwa Eprel 2026, Anietie Iniedu bụ Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ileba anya na mkpesa ọhanaeze n'ụlọọrụ ndị uweojii a kpọrọ Complaint Response Unit (CRU) jiiri ọnụ ya kwuo, na nchabi ikpe ahụ ụlọikpe nyere ga-akwalite ọrụ ndị uweojii gburugburu Naịjirịa.
Cheta na tupu ụlọikpe ekwupụta nke a, ndị uweojii eburula ụzọ kwuo n'ọnwa Disemba 2023 na ọ bụghị ịda iwu ma e see ndị uweojii foto maọbụ onyonyoo mgbe ha na-arụ ọrụ.
Iji zaghachi Onyeisi ndị uweojii, Oyinkansola Badejo-Okusanya bụ Onyeisi otu jikọtara ndị Ọkaiwu Naịjirịa kwughachiri ya ọzọ na ndị Naịjirịa nwere ikike ise ndị uweojii onyonyoo oge ha na-arụ ọrụ, kama ọ kpọrọ oku ka e wepụta iwu ndị ga-echekwa ndị uweojii mgbe ha na-ebi ndụ nke onwe ha.
Badejo-Okusanya kwuru na e kwesịrị ịkwalite nkwụwaakaọtọ oge ndị uweojii na-arụ ọrụ e dunyere ha, mana ọ dị mkpa ka ndị mmadụ ghara ise ndị uweojii onyonyoo oge ha na-ebi ndụ nke onwe ha, dịka mgbe ha na-eri nri maọbụ mgbe ha na-ezu ike, iji zere ịda iwu.



