Akụkọ dị mkpa - Septemba 8, 2026
Akụkọ dị mkpa - Septemba 8, 2026
Mgbe e biputara ya
Gee ihe na-eme n'ụwa taa n'otu nkeji:
- Gọọmenti Etiti egosila enweghị afọ ojuju gbasara etu ụlọọrụ ha nyefere n'aka ịrụ okporoụzọ si Benin gawa Asaba bụ Benin-Asaba Expressway Concession Company Limited si emebi ụfọdụ ihe dị na nkwekọrịta ha nwere.
- Babatunde Tajudeen bụ onye na-ahụ maka ọrụ okporoụzọ n'Edo Steeti yiri egwu na gọọmenti na-achọ ịnapụ ụlọọrụ a ọrụ okporoụzọ ahụ maka na ọ bụ akparamaagwa ha butere kpachi kpachi a na-ahụta na mpaghara ahụ.
- Otu na-achịkọta egwuruegwu bọọlụ na mba ụwa bụ FIFA na ogbo ha nke Afrịka bụ CAF ekwupụtala na ha ga-abịa Naịjirịa inyocha otu na-ahụ maka egwuruegwu bọọlụ bụ NFF nakwa ihe mere onyeisi ha bụ Ibrahim Musa Gusau, jiri gbaa arụkwaghịm na nso nso a.
- N'ozi FIFA wepụtara, ha dọrọ aka na ntị ka otu NFF ghara ime ntuliaka ọbụla iji họpụta onyeisi ọhụrụ ruo mgbe ha mechara nnyocha.
Soyere anyị na websaịtị, Instagram, Facebook na WhatsApp chanelụ maka akụkọ niile na-eme n'ụwa.






