BBC News, Ìgbò - Akụkọ
Isi akụkọ
Ndịagha Naịjirịa etinyela nde Naịra iri atọ n'isi 'Gentle D Yahoo'
Ozi ndịagha kesara gbasara nke a kọwara Gentle D Yahoo dịka ihe iyi egwu megide udo na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ma gbaa ọha mmadụ ume ka ha rọpụta ozi ndị ga-enyere ha aka inwuchi ya.
Mwakpo ndị na-eyi ọha egwu adịghịzi ka ọ dị na mbụ na Naịjirịa – Minista nchekwa
Ọtụtụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ minista na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa bụ Christopher Musa kwuru na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ
Igwe mmadụ sị na anyị zuru 'ohi amụ' - ebubo na-agbasa na soshal midịa
Igwe mmadụ egbuola ndị ọnụọgụgụ ha karịrị iri asatọ maka ebubo izu ori akụkụ ahụ mmadụ ji amụ nwa, BBC chọpụtara nke a na ndekọ ha wetere na mba Afrịka isii.
Onye bụ Ifeanyi Onukwubiri nwe ụlọọrụ 'TMT Travel and Tours' ndị uweojii nwụchiri?
Maazị Ifeanyi Onukwubiri bụ onye a na-ebo ebubo na o ji aghụghọ napụ ndị mmadụ karịrị narị abụọ ego sị na ọ ga nyere aka nweta akwụkwọ njem eji aga mba ofesi.
Kọwaara m isi akụkọ
Vidio, Akụkọ dị mkpa - Septemba 7, 2026, Duration 0,59
Akụkọ ndị kachasị mkpa n'ụwa taa bụ Mọnde Septemba 7, 2026.
Ọnwụ Tupac Shakur: A maala "Keffe D" Davis, onye bụbu onye ndu ndị otu nzuzo ikpe
N'ime izu ole na ole gara aga, ikpe ahụ a na-ekpe na Las Vegas lekwasịrị anya n'akwụkwọ ncheta (memoir) Davis bipụtara n'afọ 2019, ebe o dere na ọ bụ ya nyere ngwaagha e ji gbuo Tupac.
Onye bụ Stella Okunna, nwanyị mbụ bụ ọkammụta na ngalaba agụmaakwụkwọ mgbasaozi na Naịjirịa?
Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Ọkammụta Stella Okunna, nwaanyị mbụ bụ Ọkammụta na ngalaba mgbasaozi na Naịjirịa.
Ndị nwụrụ n'idemmiri Nepal agafeela 1,000 - Ụlọọrụ gbatagbata
Akụkọ kwuru n'ihe karịrị mmadụ 3,900 ka na-efu dịka ndị ọrụ karịrị mmadụ 600 tọrọ n'ime ọwara mmiri apịtị jupụtara na ya.
BBC News Igbo nọ na WhatsApp gị
Nweta akụkọ na mgbasaozi niile ndị ọrụ anyị haziri n'Igbo, ma bụrụkwa onye mbụ ga-anụ akụkọ niile dị mkpa na-akpọtụ na Naịjirịa nakwa n'ụwa niile.













































