Ụzọ ị ga-esi gbanarị mmachi akara soshal midịa gị
Ọtụtụ oge, ndị mmadụ na-etete n'ụra hụ ozi kwuru na a machiela maọbụ kagbuo akara soshal midịa ha dịka o mere ọtụtụ ndị a ma ama na soshal midịa ugbua gụnyere CarterEfe, B-Lord nakwa Tunde Ednut n'oge garaaga.
Ajụjụ ọtụtụ na-ajụ ugbua bụ; ọ bụ gịnị ka ha mere butere nke a?
Ọ bụ ndị nwe soshal midịa ga-aza nke a. Mana ka anyị jiri ihe mere Carter Efe kọwaa etu ị ga-esi gbanarị ịdaba n'udị ọnọdụ ahụ nakwa ihe ị ga-eme mgbe a machiri akara gị na soshal mịdịa.
Nchọpụta na-egosi na isi sekpụ ntị bụ ị mara ihe iwu akara soshal midịa niile mmadụ nọ na ya kwuru. Mara ihe ha kwadoro na nke ha na-akwadoghi site n'ịgụ iwu ha.
Ọzọ bụ ị mara mgbe ha gbanwere iwu ha maọbụ tinye iwu ọhụrụ.
Nke ikpeazụ bụ tupu gị etinye ihe ọbụla na soshal midịa maọbụ kwuo okwu ọ dị mkpa ka ị jụọ onwe gị ajụjụ dịka ihe a m chọrọ itinye ọ dabara n'iwu soshal midịa ahụ.
Cheta na Tiktok wepụtara iwu ọhụrụ n'Ọgọst 14 2025 nke bidoro ịrụ ọrụ na Septemba 13, 2025.
Iwu ha machiri iwepụta okwu ịkpọasị, okwu ga-akpalite ime ihe ike, nakwa ozi na-akwalite iyi mmadụ egwu, ịmaja mmadụ, ịtụ mgbere mmadụ, mmetọ mmadụ mmadụ, mmetọ ụmụanụmanụ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
Mana lee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na a machie akara soshal midịa gị
Nke mbụ bụ nao nye ahụ nwere ohere itinye akwụkwọ mkpesa bekee kpọrọ 'appeal' na soshal mịdịa ahụ.
Nchọcha BBC gosiri nao nye ihe a metụtara akara TikTok ya nwere abalị iri atọ ji mee nke a, ebe onye o metụtara Youtube ya nwere ihe ruru out afọ itinye akwụkwọ mkpsa. Na Facebook, onye ahụ nwere abalị iri itoolu iji tinye akwụkwọ.
Mana, mkpebi banyere akara soshal mịdịa gị bụ ụlọọrụ nwe soshal mịdịa ahụ ga-ekpebi ya.



