Ana m emekọta ejije na ọrụ Ọkaiwu - Chisom Sydney Ihionu

Aha onyonyo, Ana m emekọta ejije na ọrụ Ọkaiwu - Chisom Sydney Ihionu
Ana m emekọta ejije na ọrụ Ọkaiwu - Chisom Sydney Ihionu
Mgbe e biputara ya

Chisom Sydney Ihionu bụ nwaafọ Isiekenesi dị n'okpuru ọchịchị Ideatọ Saụt n'Imo Steeti ma bụrụ onye na-eme ejije nakwa Ọkaiwu.

Dịka Sydney Ihionu siri kọọrọ anyị mgbe anyị na ya nwere mkparịtaụka pụrụiche, ọ sịrị na ya gara ụlọakwụkwọ sekọndịrị na Marist Brothers' Junuorate Uturu Ọkigwe dị n'Abịa Steeti ma gụọ ihe ọmụmụ iwu na mahadum Imo steeti bụ Imo State University (Imsu).

Ọ kọwara na ya na-emekọta ejije na ọrụ Ọkaiwu n'agbanyeghị na ha abụọ na-akụpụ onwe ha oge ụfọdụ.

"Ana m eme ha abụọ. Ha na-akụkọta mgbe ọbụla, mana o mee, m họrọ nke kachasị mkpa n'oge ahụ," ka Maazị Ihionu kwuru.

Gbasara ime ejije, Sydney kwuru na ya malitere inwe mmasị na ya oge o tolitere, dịka ọ na-ahụ ndị mmadụ n'ihe onyonyoo dị iche iche, ma kọwaa na agwa ndị ọ na-egosipụta n'ejije abụghị etu ọ dị na mmadụ.

"Ụfọdụ agwa ndị a na-enye m n'ejije abụchaghị etu agwa m dị na mmadụ. Mana i wete akụkọ, ị ga-ewepụgodu onwe gị n'oge ahụ, lekwasị anya n'akụkọ e nyere gị ma mee ya nke ọma".

"Ụfọdụ akụkọ ndị m na-enweta na-adabanye n'omume m, mana ọ bụ ihe dị n'akụkọ e nyere gị ka ị ga-eme. Ana m agwa ndị mmadụ oge niile na soshal midịa abụghị ka ụwa dị. Oge ọbụla ị nụrụ 'kwụsị' maọbụ 'ọ gwụla', ị mara na i mechaala ejije ahụ, ị laghachizie n'onwe gị."

Chisom Sydney Ihionu kwukwara okwu gbasara foto ahụ a jụrụ ụmụagbọghọ onye ha chọrọ isusu ọnụ, onye ha chọrọ ịlụ nakwa onye ha chọrọ ime ọyị n'etiti ya onwe ya na ụmụokoroọbịa abụọ ndị ọzọ.

"Foto ahụ ị na-ekwu bụkwa ọnya ooo. Ọ bụrụ na m na-agụ ozi ndị mmadụ, m na-ahụ na ọ bụ "Sydney ka anyị ga-esusu ọnụ, lụọ ma hụ n'anya" m na-achị ọchị. Nne m kpọrọ m n'ekwentị oge ahụ sị m na onye niile chọrọ ịlụ gị, onye niile chọrọ isusu gị ọnụ, onye niile chọrọ ka gị na ha bụrụ ọyị. Ihe ahụ na-atọ m ọchị oge m na-agụ ya. Echere m na ọ bụ ihe ha na-ahụ n'onyonyoo ka ha na-anabata," ka o kwuru.

O kwukwara na ọtụtụ mmadụ agwala ya na o yiri Michael Dappa na-emekwa ejije mana ọ bụ Joseph Benjamin ka ya onwe ya chere na o yiri.

"Ndị mmadụ na-ekwu ya mgbe ọbụla na mụ na Michael Dappa yiri onwe anyị n'ihu mana anaghị m ahụ ya. Mana otu ihe na-atọ ọchị bụ na ụmụnne m na-ekwu ya. Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ndị enyi m na ndị otu m na-ekwu ya, aga m asị hmmm".

"Ndị mmadụ na-ekwukwa na m kachasị yie Joseph Benjamin karịa Michael Dappa mana mụ onwe m anaghị ahụ ya. Ọ bụrụ Joseph Benjamin, aga m ekweta mana ọ bụghị Michael Dappa," ka Sydney Ihionu kwuru.

Oge a jụrụ ya etu o siri mụta ịsụ asụsụ Igbo, Maazị Ihionu sịrị: "Asụsụ Igbo m anaghị aga werewere. Aga m ekwu eziokwu. Mana ana m agbalịkwa. Tupu m gaa ụlọakwụkwọ sekọndịrị n'Uturu, anaghị m asụ Igbo nke ọma mana ana m anụ ya nke ọma".

"Oge anyị na-etolite, nne m ga-asị tupu anyị anata ya ihe maọbụ nata ihe n'aka nna anyị na anyị ga-asụrịrị Igbo. Ọ bụrụ na i jighị asụsụ Igbo, ị gaghị anata ya. Ọ bụ nwayọ nwayọ ka m ji malite. Oge m gụchara ụlọakwụkwọ praịmarị, nna m ebugaa m Uturu dị n'Ọkigwe, ma ihe ahụ bụ ụlọakwụkwọ sekọndịrị ndị Katọlik nwere ebe obibi ụmụakwụkwọ".

"Oge ahụ abụ m "nwa butty" si Legọs bịa ebe ahụ, nke a mere ha ji na-akpaarị m oge ọbụla maka na amaghị m asụsụ anyị nke ọma. Asụsụ Bekee na-aga m werewere n'ọnụ mana ana m agbalị n'asụsụ Igbo. Ọ bụ etu ahụ ka m siri mụta ịsụ Igbo."

Ụfọdụ ejije ndị o mere gụnyere The Day Olivia Fell, Secrets of the Heart, What the Heart Hides, The House Manager, After the Chase, The Party Crashers nakwa ndị ọzọ.