Amerịka ga-akpọpụ ndịagha ha mmadụ 200 ha zitere na Naịjirịa na ngwụcha ọnwa Sepụtemba

Aha onyonyo, Amerịka akpọrọla ndịagha ha zitere na Naịjirịa
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Mba Amerịka na-akwado ịkpọpụ ndịagha ha ruru narị abụọ site na Naịjirịa pụọ na ngwụcha ọnwa Sepụtemba, nke ga-apịachi njem ha mere ịbịa nyere Naịjirịa aka buo aghe megide iyi ndụ egwu.

Ndị orụ gọọmentị Naịjirịa kwuru na nke a bụ eziokwu ma sị na ọ gaghị egbochi mmekọrịta dị n'etiti Naịjirịa na Amerịka ma a bịa n'okwu nchekwa.

Cheta na e zitere ndịagha Amerịka a n'ọnwa Febụwarị afọ 2026 n'ihi ọnọdụ ọjọọ nke nchekwa tinyere etu Amerịka si ahụta Naịjirịa dịka mba a na-akpagbu ndị okpukperechi Kraịst.

Mgbe ndịagha Naịjirịa na ogbo ha nke mba Amerịka na-enwe ọzụzụ n'ime ọhịa dị na Naịjirịa

Ebe foto si, Africom/X

N'ime ọnwa asaa ndị a nọrọla n'ọrụ, ndịagha mba Amerịka a nyere aka n'iwe agụgụ uche, ọzụzụ nakwa enyemaka ọrụ nye ndịagha Naịjirịa.

Ụlọọrụ ntaakụkọ Associated Press kwuru na njem ha mere ka ndịagha mba abụọ a jikọta aka ma gbuo onyendu ndị otu na-eyi ndụ egwu n'ọnwa Mee, nke a hụtara ka agha gara ọfụma megide iyi ndụ egwu.

Onyeisi ndịagha Amerịka n'Afrịka bụ Dagvin Anderson kpughere na ọtụtụ n'ime ndịagha ahụ alaghachịla na mbụ ma sị na mmekọrịta n'etiti ha ka na-aga n'ihu.

Ndịagha Naịjirịa katọrọ ụfọdụ akụkọ kwuru na mwepụ ndịagha Amerịka a bụ n'ihi nghọtaghie dị mmekọrịta ha.

Mgbe ndịagha ụgbọelu Naịjirịa na ndị nke Amerịka nwere nzukọ n'ogige ndịagha na Naịjirịa

Ebe foto si, Africom/X

Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ nchekwa na Naịjirịa bụ Ọchịagha Musa Samaila kọwara mmekọrịta ha na Amerịka dịka ihe "siri ike, ntachiobi nakwa nwee nsọpụrụ" ma kọwaa mwepụ ndịagha ahụ dịka ihe a na-emekaarị n'ụdịrị ọrụ nchekwa dị etu a.

O kwuru na mmekọrịta dị n'etiti mba abụọ a ga-aga n'ihu site na nkekọrịta amamihe, ọzụzụ ndịagha, enyemaka pụrụiche nakwa ọrụ nchekwa ndị ọzọ.

Mana ọpụpụ ndịagha mba Amerịka a na-abịa n'oge Naịjirịa ka na-enwe nsogbu nchekwa dịka mwakpo ndị ekperima na ntọrị ndị mmadụ na-agbanyeghi mbọ ha gbarala ibelata ya.

Nke a ga-abụ ihe nwale nye ndịagha Naịjirịa ma ha o nwereike ịga n'ihu buo agha megide iyi ndụ egwu na nke onwe ha, ma ọ bụrụ na ndịagha mba Amerịka pụọ.

Mgbe mbụ mba Amerịka kpọpụrụ ndịagha ha zitere na Naịjirịa

Ndịagha mba Amerịka na nke Naịjirịa ka ha na-enwe mkparịtaụka n'oge ọzụzụ

Ebe foto si, Africom/X

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

N'ọnwa Julaị afọ a mba Amerịka ewezugara ndịagha na Naịjirịa na mmalite bụ ndị so bịa buo agha megide ọnọdụ enweghị nchekwa na-arị elu nakwa iyi ndụ egwu.

Ọnụ na-ekwuru ndịagha Naịjirịa bụ Michael Onoja gwara BBC na ọnọdụ a agaghị emetụta ikike ha ji ebu agha maọlị kama ha na ndịagha Amerịka ga-aga n'ihu na-ekekọrịta ozi ndị bara uru.

Nke a na-abịa dịka Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump kwupụtara na ogbunigwe ndịagha Amerịka si n'elu tụọ na Naịjirịa memilara ndị ndu otu ndị na-eyi ndụ egwu ma kwụsịkwa ogbugbu a na-egbu ndị na-eso ụzọ Kraịst na-ebe ọ dị ukwuu.

Naịjirịa na-agabiga nsogbu enweghị nchekwa aka nri aka ekpe, nke gụnyere mwakpo otu ndị ha na ndịagha jihad na-emekọrịta ihe, ndị ojiegbe nakwa ndị omekome.

Nke a mere ka Donald Trump boo ndị ọchịchị Naịjirịa ebubo na ha anaghị agba mbọ dịka ọ kwesịrị iji chekwaa ndụ ndị ha na-achị, ma kwuokwa na a na-egbu ndị na-eso ụzọ Kraịst aghara aghara na Naịjirịa.

Kemgbe ọnwa Disemba afọ gara, Naịjirịa na Amerịka kwuru na ndịagha ha ejikọtala aka buo agha n'ogige ndị na-eyi ndụ egwu iji mee ka nchekwa sikwuo ike.