"Ụfọdụ n'ime anyị nụrụ ụda mgbe ụlọ ahụ na-achọ ịda ma gbaa ọsọ dịka ọ dagidere ndị ọzọ"

Ọtụtụ mmadụ merụrụ ahụ ebe ndị ọzọ ka tọrọ n'ime ụlọelu ogogo atọ dara n'Oko nke Anambra Steeti n'abali Sọnde 26 Julaị, 2026.
Ụlọelu ahụ a kpọrọ Elite Five Star Lodge dị n'akụkụ ebe a na-ere mmanụ ụgbọala nke Tonimas dị n'Amokpala Oko bụ ebe ụfọdụ ụmụakwụkwọ bi nke mmadụ nkịtị nwee.

Mgbe onye ntaakụkọ BBC Igbo ruru ebe ahụ, o kwuru na nnukwu ihe mere n'ebe ahụ dịka akụkụ niile nke ụlọelu kụrụ afọ n'ala.
Ụfọdụ ụmụakwụkwọ ndị gbanahụrụ ọdachi ahụ kọọrọ ya ihe mere n'abalị ahụ.
"Ụlọelu a bụ ebe anyị bi dara n'ihe dịka elekere iri na otu nke abalị Sọnde dịka anyị na-akwado ihi ụra.
"Ụfọdụ n'ime anyị nụrụ ụda dịka ọ na-achọ ịda ma gbaa ọsọ gbapụta n'ezi ebe ụfọdụ ndị apụtaghị tupuu ọ daa.
"N'abalị ahụ e bupụtara mmadụ abụọ nke m ji anya m hụụ mana amaghị m ma ha dị ndụ ka ha ọ nwụọla.
"Ụfọdụ ndị ọzọ ka tọọrọ n'ime ụvụrụ aja n'ime ụlọ ahụ."
Akụkọ kwuru na ụlọ ahụ dara n'ihe dịka elekere iri na otu nke abalị Sọnde ma dagide ọtụtụ ụmụakwụkwọ bi na ya.

Ebe foto si, Anambra Current News
"Ndị ọrụ gbata gbata na-azọpụta ndị mmadụ ugbua"

Ebe foto si, Anambra Current News
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra Steeti bụ Tochukwu Ikenga sị na ndị ọrụ uweojii, ndị ọrụ mmenyụ ọkụ na ndị ọrụ gbata gbata jupụtara n'ebe ahụ iji zọpụta ndị ka tọọrọ n'ụvụrụ aja ụlọ ahụ.
O kwuru na a mabeghi kpọmkwem ọnụọgụgụ ndị ọdachi a metụtara kama na a zọpụtala ụfọdụ ndị merụrụ ahụ dịka a ka na-achọ ndị ọzọ achọ.



























