Etu ngagharịiwe ndị ntorobia si malite n'India

Ebe foto si, EPA
A na-acha gọọmentị mba Indịa ọkụ dịka nde kwuru nde ndị otu pati a kpọrọ 'Cockroach Janta Party' (CJP) gara n''ihu na-eme ngagharịiwe maka ọnọdụ agụmaakwụkwọ na mba ahụ.
Ha na-eme ngagharịiwe n'agbanyeghị oke mmiri ozuzo tupu chi efo.
Otu pati ahụ nke ndị ntorobia hiwere chọrọ ka a hazie agụmakwụkwọ nakwa ka Mịnịsta na-ahụ maka agụmakwụkwọ bụ Dharmendra Pradhan gbaa arụkwaghịm.

Ebe foto si, Getty Images
Ngagharịiwe malitere n'ụbọchị Monde dịka nde kwuru nde ndị ntorobia ma nwoke, ma nwaanyị wujuru ama n'isiobodo mba India bụ Delhi.
Ha gara n'ụlọomeiwu mba ahụ na-agbanyeghị na ndị uweojii machiri ngagharịiwe ahụ.
Opekatampe mmadụ 60 merụrụ ahụ dịka ndị uweojii ji anwụrụ ose chụsaa ndị mmadụ ma kụsaa ochendo ndị na-eme ngagharịiwe wubere.

Ebe foto si, EPA
Ndị uweojii kwuru na ndị ọrụ ha mmadụ 118 merụrụ ahụ, ma kwụkwaa na ha nwụchiri ndị ngagharịiwe mmadụ 70.
Mana kama ibeleta maọbụ dajuo, ngagharịiwe ahụ kporoọkụ gaa n'ihu dịka ndị pati anọghị na gọọmentị kachasị sonyere na ngaghariwe a mere n'ihu ụlọ Praịm Mịnịsta mba ahụ.
Gịnị mere e ji akpọ ha 'cockroach'

Ebe foto si, Getty Images
Aha 'Cockroach Janta Party' nke bụ 'Cockroach People's Party' sitere na okwu Ọkaikpe Ukwu mba India bụ Surya Kant kwuru.
N'ụlọikpe n' ọnwa Mee, Kant iji ụchịcha na nje na-amị ọbara tụnyere ndị ntorobịa na-enweghị ọrụ bụ ndị na-etinyezi anya n'ọrụ ntaakụkọ na ịgba mbọ maka ikike dịịrị.
Mana o mechara gọọ sị na ndị ọ na-arụtụ aka bụ ndị nwere 'asambodo adịgboroja', na ọ bụghị ndị ntorobịa.
Otu a nke malitere na sochal midia tupu, ndị na-eto eto wepụta onwe malite pụtawa ama jiri uwe dịka ụchịchọ́ na-ekpocha gburugburu ma na-eme ngagharịiwe.
Kedụ etu okwu si bido na iwe ndị na-eme ngagharịiwe?

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu 'Cockroach Janta Party' na-eme ngaggarịiwe n'ihi ọnọdụ agụmakwụkwọ India.
N'abalị atọ nke ọnwa Mee, afọ 2026, ihe ruru mmadụ nde abụọ na ụma iri abụọ na asatọ (2.28m) lere ụlọ e ji aba kọleji ebe a na-azụ ndị dọkịta na mba ahụ a kpọrọ, "National Eligibility cum Entrance Test (NEET) bụ ule e kwuruna atọ nnukwu akpụ.
Mana ka abalị ole na ole gachara, a kagburu ule ahụ n'ihi ebubo na ajụjụ a jụrụ n'ule ahụ hipuru tupu ule ahụ.
Nnyocha gọọmentị mere gosikwara n'ezie na nhipu ahụ mere.
Ya bụ ihe ghọrọ ihe nnukwu mgbawa obi nye ọtụtụ lere ule ahụ bụ ndị e mere ka ha leghara ule ahụ n'etiti nchekwa siri ike.

Ebe foto si, Getty Images
Iwe ihe ahụ mere so na ihe kpalitere ngagharịiwe ndị CJP dịka ọtụtụ ezinaụlọ boro ebubo na ụmuakwụkwọ 20 kwụrụ ụdọ dịka a kagburu ule ahụ.
Nke abụghị mbụ ya, ule NEET nweburu nsogbu n'afọ 2024.
CJP chọrọ ka a hazigharịa usoro agụmakwụkwọ ka ụdị nhipụ ahu ghara ime ọzọ nakwa ka Mịnịsta agụmakwụwkọ gbaa arụkwaghịm.
N'ikpeazụ a, onyeisi otu CJP na-akpo oku ka onyeisiala mba Indịa bụ Modi gbaa arụkwaghịm n'ihi ihe a nwụchiri Sonam Wangchuk, onye na-agba mbọ maka ikike dịịrị onye bụ onye gbara abụbụ nri kemgbe abalị 26 iji kwado otu 'Cockroach Janta Party' (CJP), kpụga ya ụlọọgwụ."


























