Onye nkiri Nollywood Francis Duru anwụọla ka ọ gbachara afọ 57

Francis duru yi uwe ọdịnala nwere agwa ele ma kpuru okpu na-acha mme mme
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Onye ome ihe ejije Nollywood a ma ama bụ Francis Duru anwụọla dịka ọ rịachara obere ọrịa.

Nke a dị n'ozi ezinaụlọ ya wepụtara n'akara Instagram ya @francisduru n'isi ụtụtụ Fraịde 23 Ọktoba 2026, bụ ebe ha wepụtara ọnwụ ya.

N'ozi ahụ ha kwuru "Anyị bụ ndị ezinaụlọ Francis Duru, ji nwute na-ekwupụta ọnwụ ya dịka ọ rịachara obere ọrịa.

"Anyị na-ekele gị maka ekpere unu, ịhụnanya nakwa nghọta.

Ka mkpụrụobi ya laa n'udo. Amen."

Francis Duru dị afọ iri ise na asaa (57yrs) tupuu ọ nwụọ.

Ọtụtụ ndị otu ya n'ime ihe ejije amalitela idepụta nwute ha banyere ọnwụ ya nakwa ịkọwa ụdịrị ndụ o biri n'ụwa.