Ncheta 9/11: Ihe i kwesịrị ịma maka mwakpo a mere na mba Amerịka afọ 25 gara aga

Ebe foto si, Getty Images
E meela emume ncheta n'ebe dị iche iche taa bụ abalị 11 nke ọnwa Septemba afọ 2026, iji cheta ndị nwụrụ n'afọ iri abụọ na ise(25) gara aga ndị oyiọhaegwu wakporo mba Amerịka.
Cheta na ọ bụ n'ụbọchị 11 nke Septemba n'afọ 2001, mmadụ 2,977 nwụrụ dịka ndị oyiọhaegwu napụrụ ndị ọkwọugboelu ụgbọelu atọ ma tinye ụgbọelu ndị ahụ isi n'ụlọ azụmaahịa mba ụwa bụ 'World Trade Center' dị n'obodo New York City nakwa 'Pentagon' dị na Virginia.
Ndị njem nọ n'ụgbọelu gara ime ya nke anọ kpọkara, kwechiri dịka ha mmalitere ịlụso ndị oyiọhaegwu ọga, nke a mere ka ụgbọelu ahụ ga kpọkasịa n'otu ama dị na Pennsylvania.
Ụfọdụ ndị ọdachi ahụ metụtara kọọrọ BBC ihe ha gabigara.
Janice Brooks kwuru na a na-akpọpụ ya n'ụlọọrụ ya oge ụgbọelu nke abụọ tinyere isi ọ daa oke ụda.
Stephen Evans na-eche ka o nwee nzukọ n'ala South Tower nke 'World Trade Center' oge ụgbọelu tinyere isi, kwuru na o mere ka ahụ maa ya jiji .
" Anọ m n'ala South Tower oge ihe metụtara North Tower. Ọbụladị rue taa, ọ ka na-ama m ahụ jijiji."
"Ụgbọelu abụọ itinye isi n'ewu ewu nrịbaama abụọ dị na New York dị m ka ọ bụ anyị niile ka a wakporo. Ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ mụnye mpanaka na Union Square.

Ebe foto si, Paul Berrif
Paul Berriff, onye ose foto so n'ọtụtụ ndị mmadụ ji isi ha pụta na mwakpo ahụ, mana ọ dara ọrịa a gaghị agwọta agwọta n'ihi ya.
Berriff, onye dị afọ 80 ugbua kwuru na ya tụgbọrọ nkeji 35 dịka 'tawa nke abụọ dara, tupu ya matakwa onwe ya were hụ na ntụ simentị juru ya ọnụ.
"Enweghị m ike iku ume, okpofụfụ na-agba m, uwe traụza m na-ere m ọkụ, ebe niile gbachara ojii. Ọtụtụ n'ime anyị pụtara na ndụ ụbọchị ahụ chere na nsogbu adịghị mana ọrịa dapụtara ka afọ atọ maọbụ anọ gara."
"Anyị niile kubara ikuku akụkụ ahụ ndị mmadụ, ugegbe, mmanụ ụgbọaala na ihe ndị ọzọ gwakọrọ, ugbua ha palitere anyị ọrịa."



























