Ndịagha Naịjirịa azọpụtala ụmụnwaanyị na ụmụaka 360 ndị na-eyi ọha egwu tọọrọ na Borno steeti

Ndị ahụ ndị ọru nchekwa Naịjirịa zọpụtara gụnyere ụmụnoke, ụmụnwaanyị na ụmụaka.

Ebe foto si, HQ Nigerian Army/Facebook

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa bụ Northeast Joint Task Force, Operation HADIN KAI ekwuola na ha azọpụtala mmadụ narị atọ na iri isii site n'ogige ndị na-eyi ọha egwu nke ndị otu Jama'atu Ahlis Sunna Lidda'awati wal-Jihad (JAS) dị na mpaghara ugwu Mandara na ndịda Borno steeti.

N'ozi nke ọnụ na-ekwuchitere otu ndị ọrụ nchekwa ahụ bụ Lieutenant Colonel Haruna M. Sani kwupụtara nke a n'ụbọchị Sọnde 7 Juun, kọwara zọpụta ahụ dịka nke mịtara mkpụrụ n'ihi ọtụtụ izu e ji kpokọta ozi nzuzo, nledo anya, na nhazi ọrụ ndịagha.

O kwuru na nke a mere ka ha zọpụta ụmụnoke, ụmụnwaanyị na ụmụaka na-enweghị mmerụ ahụ ọbụla.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị omekome ahụ tọọrọ ndị ahụ site n'obodo dị iche iche ọkachasị na mpaghara ndị dị na Ngoshe ma dosaa ndị a n'ọnọdụ ọjọọ.

Sani kwuru na ụmụaka abụọ nwụrụ n'ihi oke ike ọgwụgwụ nakwa oke ahụhụ ha tara n'ogologo oge ha nọrọ n'aka ndị na-eyi ọha egwu.

Sani kwuru na ụmụaka abụọ nwụrụ n'ihi oke ike ọgwụgwụ nakwa oke ahụhụ ha tara n'ogologo oge ha nọrọ n'aka ndị na-eyi ọha egwu.

Ebe foto si, HQ Nigerian Army/Facebook

"A kpọpụtara ndị ọzọ na-enweghị mmerụ ahụ, kpọga ha n'ebe nchekwa dị mma maka nlekọta ahụike na enyemaka," ka Sani kwuru n'ozi ahụ.

N'aka nke ọzọ, ndịisi ndịagha jara ndị ọrụ nchekwa niile ike maka mbọ ha gbara n'ọrụ ahụ, na otu ha siri gosi obi ike n'izọpụta ndị ahụ a tọọrọ.

Ọ kọwara na ndịagha ahụ wakporo ogige ndị na-eyi ọha egwu ahụ n'ike site n'oke ọgụ ndịagha gosipụtara nke mere ka ọtụtụ ndịagha nnupụisi ahụ gbapụ n'ogige ebe ahụ gbabaa n'ime ọtụtụ ugwu gbara ha gburugburu, ebe ndị ọzọ nyefere onwe ha n'aka ndịagha Naịjirịa.

N'agbanyeghị na ndịagha Naịjirịa ekwupụtaghị ọnụọgụgụ ndị na-eyi ọha egwu nyefere onwe ha, Sani kwuru na ha amalitela inye ndị ahụ ha zọpụtara nnyocha ahụike ha, ma kpọpụ ha na mpaghara ebe ahụ e jichiri ha.

Gọvanọ Zulum etoola ndịagha Naịjirịa maka izọpụta mmadụ 360 ahụ

Zulum kwuru na gọọmenti agaghị ezu ike ruo mgbe ha zọpụtara ụmụakwụkwọ niile a tọọrọ n'obodo ahụ

Ebe foto si, The Governor of Borno State/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Aka na-achị Borno Steeti bụ Babagana Zulum etoola ndịagha Naịjirịa, ọkachasị ndị ọrụ nchekwa 'Operation HADIN KAI', maka ịzọpụta mmadụ narị atọ na iri isii a tọọrọ nọ n'ogige ndị na-eyi ọha egwu a ma ama dị n'Ugwu Mandara nke mpaghara ndịda steeti ahụ.

O kwuru na ọrụ ndị nchekwa a, nke mere ka a zọpụta ọtụtụ narị ụmụnwoke, ụmụnwaanyị na ụmụaka ndị na-eyi ọha egwu tọọrọ, e tinyela olileanya n'etiti obodo ndị ihe metụtara.

Ọ gbakwụnyere na nke a gosipụtara mmezu nkwa nke gọọmentị etiti, ndịagha Naịjirịa na gọọmentị Borno steeti kwere ịweghachita udo na-adịgide adịgide na mpaghara ahụ.

Zulum kelere Onyeisiala Bola Tinubu, ndị ọchịagha niile na-ahụ maka 'Operation HADIN KAI', nakwa ndịagha niile gbara mbọ n'ọrụ nzọpụta ahụ mịtara mkpụrụ.

O kelekwara ndị obodo ahụ maka nkwado, nghọta, na mmekọrịta ha gosipụtara, nke mere ka ndịagha weta mmeri n'ọrụ nzọpụta ahụ.

Gọvanọ Zulum tiri ndị obodo Mussa nọ n'okpuru ọchịchị Askira Uba aka n'obi ma kwuo na gọọmenti agaghị ezu ike ruo mgbe ha zọpụtara ụmụakwụkwọ niile a tọọrọ n'obodo ahụ.

Ndị nchekwa amalitela ịchọ ụmụaka 50 ndị ojiegbe tọọrọ na Mussa, Borno steeti

Cheta na ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu jihadist wakporo ụlọakwụkwọ atọ dị na Mussa n'ụbọchị Fraịde 15 Mee 2026.

Ebe foto si, AFP via Getty Images

Ndị ọchịchị Borno steeti ezigala ndị nche obodo na ndị nchekwa iji chọta ụmụaka ruru ihe dịka iri ise nke ndị ojiegbe tọọrọ n'ụlọakwụkwọ dị na Mussa.

Onyeisioche nke okpuruọchịchị Askira Uba nke ya na ogbo ya si Chibok gara obodo Mussa n'ụbọchị Sọnde 17 Mee iji tie ndị nne na nna nke ụmụaka a tọọrọ aka n'obi ma kwe nkwa ime ihe niile ha nwereike ime iji hụ na a tọhapụrụ ha ma kpọghachite ha n'ụlọ.

Ọ gwara ndị nne na nna na otu ndị nche nd ndịagha ga-arụkọ ọrụ iji chọpụta ebe ndị tọọrọ ahụ nọ.

Ka ọ dị ugbu a, otu nne na nna agwara BBC na ụmụaka abụọ n'ime ụmụakwụkwọ a tọọrọ agbapụla n'aka ndị jidere ha ma laghachi n'ezinaụlọ ha.

Cheta na ndị a na-enyo enyo na ha bụ ndị otu jihadist wakporo ụlọakwụkwọ atọ dị na Mussa n'ụbọchị Fraịde 15 Mee 2026, na-agba egbe iji mee ka ụjọ jide ha tupu ha chịkọta ụfọdụ ụmụakwụkwọ wee buru ha n'ụgbọ ọgbatumtum ma pụọ.

E kwukwara na ọtụtụ n'ime ụmụaka ahụ bụ obere ụmụaka dị n'agbata afọ abụọ na ise, si Mussa Central Primary School nke nwere ụlọakwụkwọ ọta akara na ngalaba praịmarị.

Ndị hụrụ ihe merenụ n'ụtụtụ Fraịde na Mussa, Borno steeti, kwuru na ndị a na-enyo enyo ji ụmụaka ahụ kpochie onwe ha mgbe ha na-agba ọsọ n'ụgbọ ọgbatumtum nke na-egbochi ndị nchekwa ịgba ha egbe.

Ka ọ dị ugbu a, o nwebeghị otu kwuru na ọ bụ ha mere mwakpo ahụ.

Ntọrọ ndị a mere n'ụlọakwụkwọ sekọndrị nke gọọmenti nwe bụ Government Day Secondary School, ụlọakwụkwọ praịmarị Mussa Central Primary School, na ụlọakwụkwọ sekọndrị nke State Universal Basis Education Board (SUBEB).