Sunday Ajuluchukwuucheya: Ihe anyị ma maka onye amụma a sị na-ere egbe igwe e ji maka chamdum ego dị nde 70

Ebe foto si, EFCC
Ngalaba na-ebu agha megide nrụrụaka na Naijiria ekwuola na ha na-enyocha otu onye amúma a kpọrọ 'Sunday Ajuluchukwucheya maka ebubo igwu ndí úka ya chadum ego karírí nde naira iri asaa(N70m).
Nke na-abịa dịka otu onye ụka nwaamadi ahụ bụ Okey Uwakwe degara EFCC akwụkwọ mkpesa na-ebo ebubo na onye amụma ahụ napurụ ya nde naira atọ na ụma (N3, 251, 200) kwe ya na ọ ga-eme ka nwunye nwanne ya nwoke chọrọla nwa afọ 15 tụrụ ime.
O bokwara ebubo na onye amụma ahụ napụrụ ya nde naira isii na ụma(6,231,000) iji rụọrọra ya ọrụ mmụọ ka nwanne ya nwoke gara mba ofesi kemgbe afọ 1997 alataghị alata ka ọ lọta.
Dịka EFCC si gbaa n'ama, nnyocha ha gosiri na onye am uma ahụ na-alafu ndị ụlọọụka ya site nịgwa ha ka ha zụọ ihe ekpere maka ọganịru ihe dịka ' sticker' nakwa egbe igwe nke mmụọ nso ', iji nweta ogbugbo mkpa ha.
Otu onye kwuru, ka m zụchara ihe nile ndị ahụ, nsogbu ka dịkwa ka ọ dị.
























