Ụlọikpe Kachasị eyigharịala mgbe ọ ga-ekpebi ikpe banyere esemokwu dị n'etiti pati ADC

Aha onyonyo, Anyị agaghị anabata mpụtara ọgbakọ ọbụla ADC mere - Onyeisioche Inec
Ụlọikpe Kachasị eyigharịala mgbe ọ ga-ekpebi ikpe banyere esemokwu dị n'etiti pati ADC
Njirimara otu ndọrọndọrọ ọchịchị African Democratic Congress (ADC).

Ebe foto si, ADCNig/X

Ụlọikpe kachasị na Naịjirịa ekwuola na ha ga-ekpebi ikpe maka esemokwu dị n'ime otu Pati African Democratic Congress (ADC) iji mara ndị ga-abụ ndị ndu pati ahụ n'ezie.

Ụlọikpe a ekwubeghi ụbọchị ha ga-eme nke a kama na ha ga-eme ka ndị niile nke a metụtara mara maka ụbọchị ha ga-ekpe ikpe ahụ.

Mmadụ ise ndị Ọkaikpe nke Garba Mohammed so na ya mere ka a mata nke a n'oge ha nụchara okwu David Mark wetere n'ụlọikpe ahụ.

David Mark na-ekwu na ụlọikpe enweghị ikike n'iwu Naịjirịa inye mkpebi banyere ihe mere n'ime otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Ọkaiwu David Mark bụ Jibrin Okutepa kwuru na Maachị 21, 2025 ka ụlọikpe kachasị nyere mkpebi na "ụlọikpe enweghị ikike ikpeikpe maka ihe na-eme maọbụ ihe mere n'ime otu ndọrọndọrọ ọchịchị".

Mana ọkaiwu nke Nafiu Gombe bụ Robert Emukpero gwara ụlọikpe kachasị ka ha hara ịnaba ihe Jibrin Okutepa kwuru.

Ndị pati ADC emeela ngagharịiwe n'Abuja

Ndị pati African Democratic Congress (ADC) emeela ngagharịiwe iji gosipụta iwe ha gbasara mkpebi INEC nwere na nso nso a na ha agaghị anabata ngalaba otu ADC nke David Mark nọ n'isi ya.

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị ADC haziri ngagharịiwe a n'ụbọchị Wenezde 8 Eprel 2026 n'isi obodo Naịjirịa bụ Abuja.

Ha ji ọkọlọtọ nke ha depụtara ebumnobi ha, dịka "Tinubu, kwere ka ọchịchị onye kwuo uche anyị kute ume."

Ụfọdụ ndị a hụrụ na ngagharịiwe ahụ gụnyere aka chịbụrụ Anambra Steeti nakwa onye ji aha Labour Pati zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 bụ Peter Obi, aka chịburu Kano Steeti nakwa onye ji aha NNPP zọọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2023 bụ Rabiu Kwankwaso nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.

Anyị agaghị anabata mpụtara ọgbakọ ọbụla ADC mere - Onyeisioche Inec

Onyeisioche Independent National Electoral Commision (Inec) bụ Joash Amụpitan, ekwuola kpọm kwem na Inec agaghị anabata mpụtara nnukwu ọgbakọ National Convention ọbụla African Democratic Congress (ADC) mere ruo oge ụlọikpe kpebiri ikpe esemokwu ahụ banyere onye bụ onyeisioche ADC.

O kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ụlọọrụ Arise News nwere na nso nso banyere nkagbu ụlọọrụ Inec kagburu aha David Mark dịka onyeisioche pati ADC.

Banyere ebubo ADC boro na ọ bụ gọọmenti etiti na-akwado Inec ka ha tinye ọgbaaghara na pati ha, Amupitan kwuru nae bubo ahụ abụghị eziokwu ma ncha.

O mere ka o doo any na Inec bụ ụlọọrụ na-erube isi nye iwu nakwa mkpebi ụlọikpe ma kwuo na Inec enweghị atụmatụ ọbụla ime ka Naịjirịa nwee naanị otu pati ndọrọndọrọ ọchịchị.

Gịnị butere esemokwu a?

Nafiu Bala bụ onye kpụpụrụ ADC n'ụlọikpe ma kwuo na ọ bụ ya kwesịrị ịbụ onyeisioche pati ADC dịka Ralph Nwosu bụbu onyeisioche ADC gbara arụkwaghịm na Julaị 2025. Oge Ralph Nwosu bụ onyeisioche ADC, Nafiu Bala bụ osote ya.

Mana oge Atiku Abubakar, Peter Obi na ọtụtụ ndị ọzọ batara ADC na Julaị 2025, Nwosu nyefere ọkwa onyeisioche pati ADC n'aka David Mark.

Ọ bụ nke a mere ka Nafiu Bala gbaa ha akwụkwọ n'ụlọikpe ma kwuo na ọ bụ ya kwesiri ịbụ onyeisioche ADC.

N'aka nke ọzọ, onyeisi mgbasaozi pati ADC bụ Bolaji Abdullahi, kwuru na Nafiu Bala gbara arụkwaghịm na pati ADC kemgbe abalị iri na asatọ nke ọnwa Mee, 2025.

Cheta na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị isi kara aka họpụtara ADC n'ọnwa Julaị 2025 dịka 'coalition party' n'olu bekee iji napụ ọchịchị n'aka Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu nke All Progressive Congress (APC) na ntuliaka n'afọ 2027.

Ihe pati ADC kwuru

Ka o si na dị, African Democratic Congress (ADC), ekwuola na ha ga-aga n'ihu mee nnukwu ọgbakọ 'National Convention ha n'ụbọchị Tuzde 14 Eprel, 2026 n'agbanyeghị na Inec kagburu aha ndịisi otu National Working Committee ha gụnyere onyeisioche ha bụ David Mark, odeakwụkwọ ha bụ Rauf Aregbesola na ndị ọzọ n'akwụkwọ ha maka ikpe ahụ dị nọ n'ụlọikpe.

ADC kwuru na o doro ha anya na ọ bụ gọọmenti etiti na-akwanye Inec ọkụ n'ike ka ha tinye nsogbu na pati ADC maka na ha ahụla ọtụtụ nkwado ndị Naịjirịa na-enye ha dịka ntuliaka afọ 2027 na-akpọdobe nso.

Lee usoro ADC wepụtara banyere nnukwu ọgbakọ ha:

  • Nnyocha ndị ga-azọ ọkwa - Eprel 7
  • Mkpesa banyere nnyocha ndị na-azọ ọkwa -Eprel 8
  • Ọgbakọ wọọdụ na nke okpuru ọchịchị - Eprel 9
  • Mkpesa banyere ọgbakọ okpuru ọchịchị - Eprel 10
  • Ọgbakọ Steeti - Eprel 11
  • Mkpesa banyere ọgbakọ steeti - Eprel 12
  • Nnukwu ọgbakọ kọnvenshọn - Eprel 14