Gọọmenti Naịjirịa akpụpụla mmadụ iri n'ụlọikpe maka ebubo ịrụ ọgwụ ike
A kpụrụ mmadụ iri ahụ gụnyere ndị mba Meziko atọ na ụmụafọ Naịjirị asaa n'ụlọikpe dịka ndị ọrụ Nigeria Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) nwụchiri ha ma machie ọgwụ ike ha kwuru na ọ bụ nke kachasị na Naịjirịa.
Ọ bụ n'ime oke ọhịa dị n'okpuru ọchịchị Ijebu dị n'Ogun steeti ka a chọpụtara ebe mmadụ iri na-arụ ọgwụ ike ndị ahụ.
Ọ bụ n'ogige ebe ha nọ arụ ọgwụ ike ahụ ka e hiwere ụlọikpe ọha iji nye ụlọikpe ahụ ohere ịhụ ma mee nnyocha banyere mkpa mkpa mmadụ atọ na-akpa.
Ihe ọzọ mere e ji hiwe ụlọikpe ahụ ebe ahụ bụ maka na ọtụtụ ihe akaebe gụnyere kemịkal ha ji arụ ọgwụ ike ndị ahụ dị na nnukwu ite dị iche iche nke a na-enweghị ike ibuga ebe ọzọ ruo oge e mechara nnyocha.
Onye ntaakụkọ BBC gara ebe ahụ hụ etu ihe si aga, kọwara na mmadụ iri ahụ gọnarịrị na ha na-eme ọgwụ ike ma kwuo hoo ha na aka ha dị ọcha.
Akụkọ kwuru na ndị ọrụ NDLEA nwụchikwara mmadụ ise ọzọ maka ebubo iso n'otu na-arụ ọgwụ ike nke ha n'otu mba Meziko na-arụ ọgwụ ike na-enwe mmekọ.



