'Mba niile chọrọ imeri Naịjirịa' - Otu egwu bọọlụ Super Falcons na-achụ iko Wafcon nke iri na otu

Ndị ọgbaa bọọlụ na ndị nkuzi ha na-enwe aṅụrị dịka Naịjirịa na-ebuli iko asọmpi Women's Africa Cup of Nations (Wafcon). Onyeisi otu egwu bọọlụ Naịjirịa bụ Rasheedat Ajibade, weliri iko ahụ elu, ebe onye oche goolu bụ Chiamaka Nnadozie na onye mkpachi bụ Asisat Oshoala nọ n'akụkụ ya. Ashleigh Plumptre guzoro n'azụ ha, ji ọkọlọtọ Naịjirịa kpuchie onwe ya.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Naịjirịa emeriela ugboro iri n'ime asọmpi ụmụnwaanyị iri na otu nke Women's Africa Cup of Nations (Wafcon) kemgbe e hiwere ya n'afọ 1998.
    • Onye dere ya, Emmanuel Akindubuwa
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Sport Africa, Lagos
  • Mgbe e biputara ya
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Otu egwu ụmụnwaanyị Super Falcons nke Naịjirịa alaghachila Moroko iji chekwaa okpu eze ha n'asọmpi ụmụnwaanyị Afrịka a kpọrọ 'Women's Africa Cup of Nations' (Wafcon) 2026, ebe ha na-achọ imeri asọmpi ahụ nke ugboro iri na otu.

Naịjirịa bụ naanị mba maburula iko WAFCON ugboro iri n'Afrịka. Ha meriri n'asọmpi e mere na Moroko n'afọ gara aga, mgbe ha si n'azụ laghachi ma merie ndị haziri asọmpi ahụ site n'ọkpụ atọ a satara naanị abụọ n'ịmaaka ikpeazụ.

Onye nkuzi otu Super Falcons bụ Justin Madugu kwuru na ọ maara na ibughachite iko ahụ agaghị adị mfe n'ihi na mba niile chọrọ imeri Naịjirịa.

O kwuru: "Ugbu a anyị bụ ndị mmeri, mba niile ga-achọ ịkwatu anyị. Anyị maara na ọ gaghị adị mfe, mana anyị kwadoro nke ọma."

'Anyi anọghị n'ujọ'

Dịka onye na-agba n'akụkụ bọọlụ bụ Francisca Ordega siri gwa BBC Sport Africa: "Ihe mbụ anyị lekwasịrị anya bụ inweta tiketi asọmpi Iko Mbaụwa. Mgbe anyị mepụtara nke ahụ, anyị nwere ike chepụta maka ibugahchite iko anyị.

"E nweghị nrụgide ọ bụla na-anyịgbu anyị. Anyị nwere ike iguzo dika dike megide otu bọọlụ mba ọ bụla n'Afrịka.

Naịjirịa ga-amalite njem ha n'asọmpi ahụ site n'ịmaaka megide mba Malawi tupu ha ezute Zambia na Ijipt n'egwuregwu nke otu Ch.

Onye enyemaka onye nkuzi na onye bụbu onye ochee goolu nke Super Falcons bụ Ann Chiejine, kwuru na ndị otu bọọlu Naijiria ga-arụsi ọrụ ike karịa na mbụ.

Chiejine kwuru, "Mba niile chọrọ imeri Naịjirịa. Nke ahụ pụtara na anyị ga-arụsi ọrụ ike karịa ma kwado otu bọọlu anyi nke ọma."

Asọmpi Wafcon nke afọ a abụghị naanị maka ịchọta onye mmeri n'Afrịka. Mba anọ ga-eru agba nke anọ ga-enwetakwa tiketi ịga Iko Mbaụwa ụmụnwaanyị FIFA 2027 ga-eme na Brazil.

Onye egwu Super Falcons, Francisca Ordega, kwuru na ihe kacha ha mkpa ugbu a bụ ị nweta tiketi ahụ tupu ha echee maka igbachite iko ha.

"Ebumnuche mbụ anyị bụ iru Iko Mbaụwa. Mgbe ahụ ka anyị ga-eche maka ichekwa iko WAFCON anyị. Anyị anaghị atụ egwu otu ọ bụla n'Afrịka," Ordega kwuru.

Otu egwu bọọlụ Naịjirịa nwere ndị ma ihe ekwe na-akụ nakwa ndị ọhụrụ

Asisat Oshoala, yi uwe egwuregwu Naịjirịa na-acha akwụkwọ ndụndụ nke e dere akara 8 n'ihu ya, na-achụ bọọlu n'oge egwuregwu ha na mba Zambia gbara. A na-ahụ ndị egwuregwu Zambia atọ n'azụ ya, yi uwe elu na sọks na-acha ọla kọpa, tinyere mkpụmkpụ uwe ojii, ka ha nọ n'elu ahịhịa akwụkwọ ndụ. N'azụ ha, a na-ahụ ebe ndị na-ekiri egwuregwu na-anọdụ ala nke oche ọcha juru, mana ihe onyonyo ahụ achapụtaghị doo anya.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Asisat Oshoala, onye nweterela ihe nrite egwuregwu bọọlụ bụ 'Nwaanyị Kachasị Agba Bọọlụ n'Afrịka, ga-abụkwa otu n'ime ndị ga-eso n'otu egwu bọọlụ Naịjirịa n'asọmpi Women's Africa Cup of Nations (Wafcon) 2026 a na-agba na Moroko.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Madugu kọwara otu egwu bọọlu Super Falcons dịka otu egwu ndị maara ihe ekwe na-akụ na ndị ọhụrụ.

Ndị dịka Rasheedat Ajibade, onye meriri ihe nrite onye kacha pụta ihe na Wafcon gara aga, Chiamaka Nnadozie, onye bụ onye ochee goolu Afrịka nke afọ, na Asisat Oshoala, onye nwere ihe nrite onye egwuregwu nwaanyị Afrịka ugboro isii, ga-edu ndị otu ahụ.

N'otu oge ahụ, ndị ọhụrụ dịka Joy Omewa na onye ochee goolu dị afọ 21 Comfort Erhabor, bụ onye a mụrụ na Netherlands ma tolite na Ịngland, sonyekwara n'otu egwu ahụ.

Erhabor kwuru na ịhọrọ ịgbara Naịjirịa bọọlụ bụ mkpebi dịrị ya mfe. "Ọ dị m n'ọbara. Ọ dịghị ihe ga-enye m nsọpụrụ karịa ịgbachitere obodo nna na nne m."

Asọmpi WAFCON nke afọ a amụbaala site n'otu egwuregwu iri na abụọ ruo iri na isii, nke pụtara na ọgụ ga-esikwu ike.

Ndị dịka Malawi, nke na-abịa Wafcon nke mbụ ha, nwere ụmụnne Tabitha na Temwa Chawinga, ebe Zambia nwekwara Barbra Banda na Racheal Kundananji, bụ ndị a na-atụ anya na ha ga-eweta nnukwu ihe ịma aka.

Madugu dọrọ ndị otu ya aka na ntị ka ha ghara ileghara mba ọbụla anya.

"Anyị agaghị eleda otu ọ bụla anya. Anyị ga-asọpụrụ ndị niile anyị ga-egwu megide ha," Madugu kwuru.

Ihe nrite ego mba ga-emeri na WAFCON abawanyela ruo $2 nde, ihe na-egosi uto asọmpi ahụ na egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị n'Afrịka.

N'agbanyeghị na asọmpi ụmụnwaanyị n'Afrịka na-etolite ngwa ngwa, ọtụtụ ka na-ahụ Super Falcons dịka otu a ga-emeri.