Onyeisiala Buhari ekwughị eziokwu
N'ezie, gọọmenti etiti malitere atụmatụ Iwughari akụnaụba nke ha kpọrọ Economic Recovery and Grwoth Plan 2017-2020 mana , ha emezughị nkwa ahụ ha kwere maka osikapa rue ngwụcha 2018. Imezu nkwa ahụ n'ọka wit adịghị ka ihe ga-ekwe ha mee.
N'atụmatụ ahụ, Naijiria kwesịrị ị na-akọpụta osikapa niile a na-eri n'ala Naijiria n'afọ 2018, ma kọpụta ọka wit niile a na-eri n'ala n'afọ 2010.
N'agbanyeghị na nkọpụta osikapa na-agbalite nwayọọ,nwayọọ n'afọ ise gara aga, dịka a na-atụ anya na ọ ga-agbalitekwu n'afọ 2019 mana Naijiria ka sọ na mba ndị kachasị atụbata osikapa na mbaụwa.
N'afọ 2014, oge ọnụahịa osikapa bụ dọla narị anọ ,irir abụọ na ise, Naijiria na-atụbata osikapa ruru nde abụọ na narị 6 metrik tọns nke pụtara nde dọla atọ, puku iri abụọ na asaa, nanarị anọ( $3,027,400)
N'afọ 2018, ọnụ metrik tọns osikapa agbanweghị n'ụzọ pụrụ iche. Ugbua, osikapa na-ada dọla narị anọ iri abụọ na otu maka otu metrik tọn. Agbanyeghị na ole a na-atụbata agbadatala, ị gbakọọ ego nde metrik tọn osikapa abụọ, narị anọ, Naijiria mefuru nde dọla abụọ, narị asaa, puku iri isii na isii, iri abụọ na asaa($2,766,027.40) maọbụ nde dọla abụọ( $2.7 million) kwa ụbọchị
Ọnụọgụgụ ndị na-achọ osikapa na-arị dịka ọnụọgụgụ ụmụ Naijiria na-amụbanye. Ụmụ Naijira akwụsịbeghị mmasị ha nwere n'ebe osikapa nọ.
E nweghị nri zuru ọnụ bụ nnukwu nsogbu na Naijiria. Ọgbaghara dị na Ọwụwa-anyanwụ Mgbagougwu, nakwa mpaghara etiti Naijiria so metụta ihe a na-enweta n'ubi nakwa ego ezinaụlọ na-enweta na ire ihe ha nwetara n'ubi.
Dịka ngụkọ Global Hunger Index (GHI), Naijiria nọ n'ọkwa 103 n'ime mba 119 ebe agụ na-anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ.
N'ọnwa Maach, afọ 2018, onyeisiala Buhari hiwere otu 'National Food Security Council', otu ọ bụ onye ndu ha, nye ha ọrụ ịhụ maka nchekwa nri.