Ụlọikpe atụọla ihe ruru mmadụ 150 nga maka iyi ọha egwu

Aha onyonyo, Ụlọikpe atụọla ihe ruru mmadụ 150 nga maka iyi ọha egwu
Ụlọikpe atụọla ihe ruru mmadụ 150 nga maka iyi ọha egwu
Mgbe e biputara ya

Ụlọikpe atụọla mmadụ atọ nga maka agbaghị ama gbagide ndị Boko Haram ma tụọ mmadụ ruru otu narị na iri ise nga maka ebubo iyi ọha egwu.

Ulọikpe kwuru na mmadụ atọ ndị ahụ ọ tụrụ nga dara iwu dịka ha mechiri ọnụ, hara ịgba ama gwa ndị ọrụ nchekwa banyere ihe ha mara maka ndị Boko Haram.

Ọkaiwu ukwu Naịjirịa bụ Lateef Fagbemi wetere ikpe ahụ n'ụlọikpe ọkaikpe Binta Fatimah Nyako n'Abuja.

Onye mbụ na mmadụ atọ ndị ahụ bụ nwoke na-akọ ọrụ ugbo dị afọ iri ise na ise aha ya bụ Ali Mustapha si n'obodo a na-akpọ Katara dị na Borno steeti.

Kamgbe afọ 2013 ka Ali nọ n'ụlọmkpọrọ tupu ọkaikpe Nyoko ekpebie ikpe ya ma nye ya nga afọ iri na ise mana a ga-ebido n'afọ 2013 na-agụkọrọ ya.

Onye ọzọ bụ Isa Isiaka. Ọkaikpe Nyako tụrụ ya nga afọ iri abụọ maka ebubo izoro gọọmenti ihe ọ maara banyere ndị Boko hara.

Onye nke atọ bụ onye ji ego achụ nta ego, na-eme nke bekee kpọrọ 'Point of sales (POS) aha ya bụ Umar Bashir. A tụrụ Umar Bashir nga afọ iri abụọ maka na ndị Boko Hara ji ọba ego ya na-eke ego maọbụ na-ezipu ego.

Ndekọ dị n'ụlọikpe gosiri na Umar kwetere na otu Onye Boko Haram tinyere ego ruru nde naịra ise n'ọba ego ya nke ya mechere ziga n'ọba ego ndị na-eyi ọha egwu.

N'ihe a niile mmadụ atọ ndị a gwara ụlọikpe na ebubo e boro ha bụ eziokwu ma rịọ mgbaghara mana ọkaikpe Binta Nyako tụrụ ha ng ana-enghị ohere iji oge gbara isi onwe ha maọbụ daa nha.

Ụlọikpe Ukwu dị n'Abụja amaala opekatampe mmadụ otu narị na iri ise ikpe maka ebubo iyi ọhaegwu dịka ụbọchị abụọ nke ikpe ahụ na-aga n'ihu na Naịjirịa gachara.

Nke a na-abịa dịka e kwuru na a na-atụ anya na mmadụ iri asatọ na anọ ndị ọzọ ga-apụta n'ihu ndị ọkaikpe taa bụ Wenezde 17 Juun 2026.

Cheta na Naịjirịa kpụpụrụ ọtụtụ mmadụ a na-enyo enyo n'ebubo iyi ọha egwu n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja, isiobodo Naịjirịa n'ụbọchị Mọnde 15 Juun, 2026.

Ka ọ dị ugbua, a na-enyocha ihe dịka mmadụ 600 n'ime usoro ikpe a.

Ọkaiwu ukwu nke Naịjirịa bụ Maazị Lateef Fagbemi gwara ndị ntaakụkọ na a na-ekpe ndị a na-enyo enyo ikpe maka ebubo ndị metụtara mpụ iyi ọha egwu.